4
IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN: 12 TH SUNDAY IN ORDINARY TIME (YEAR A) SUNDAY, JUNE 25, 2017 HYMNS: ENTRANCE: K’ANYI KPOO ISI ALA OFFERTORY: ONYINYE GI OKWESIRI…/WETANU… CONSECRATION: EARTHLY GIFTS COMMUNION: NRIOMA/KA ANYI JENU NARA POST COMMUNION: O SACRAMENT MOST HOLY DISMISSAL: KA MBA NILE TOO GI

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA … · ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume; Gi bu onye ahu na-enyocha

  • Upload
    others

  • View
    0

  • Download
    0

Embed Size (px)

Citation preview

Page 1: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA … · ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume; Gi bu onye ahu na-enyocha

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW

YORK,

AT ANGELA MERICI PARISH,

BRONX, NEW YORK.

SUNDAY BULLETIN: 12TH SUNDAY IN

ORDINARY TIME (YEAR A)

SUNDAY, JUNE 25, 2017 HYMNS:

ENTRANCE: K’ANYI KPOO ISI ALA

OFFERTORY: ONYINYE GI OKWESIRI…/WETANU…

CONSECRATION: EARTHLY GIFTS

COMMUNION: NRIOMA/KA ANYI JENU NARA

POST COMMUNION: O SACRAMENT MOST HOLY

DISMISSAL: KA MBA NILE TOO GI

Page 2: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA … · ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume; Gi bu onye ahu na-enyocha

IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo onye Amuma Jeremaya 20:10-13

Isi Okwu: O naputara obi ndi no na mkpa n’aka ndi ajo mmadu

Jeremaya kwuru si: “N’ezie, anula m izu ojoo nke otutu mmadu na-agba megide m si: ‘Egwu dikwa

n’ebe nile! Gbagide ya ama! K’anyi gbagide ya ama! Ndi nile mu na ha di na mma na-eche mgbe o

bula m ga-azohie ukwu daa. E leghi anya, onya ga-ama ya, anyi enweta ya, booro onwe anyi obo

ihe o mere anyi’ Ma Onyenweanyi nonyeere m, dika oke dikeogu. Ndi na-ebuso m agha ga-asu

ngongo. Ha agaghi emeri. Ihere ga-eju ha anya n’odida ha, wee butere ha oke ogba gharii di ebighi

ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi

omume; Gi bu onye ahu na-enyocha uche na obi mmadu, kwee ka m jiri anya m hu obo I ga-

abogwata ha, maka na o bu Gi ka m kpesaara olu m. Kwere Onyenweanyi ukwe. Too Onyenweanyi

maka na Onyenweanyi agbaputala ndu umu ogbenye n’aka ike nke ndi ajo omume.

Okwu nke Oseburuwa.

Ekele diri Chukwu.

ABUOMA NA AZIZA YA

Aziza: Onyenweanyi, were nnukwu ihunanya Gi za m oku.

1. N’ihi Gi ka m ji ana nkocha. Ihere ekpuchiela m ihu. Aghoola m onye a tupuru n’iwu n’ebe

umunne m no. Biakwa ghoo onye obia n’etiti umunne m, ndi otu nne muru mu na ha.

Maka na obi inu oku maka Gi erepiala m. Nkocha ndi na-ekwuto Gi na-ala m n’isi. Aziza

2. Onyenwe m, ana m ario Gi; Chineke m, ana m ario amara Gi. Na nnukwu obi oma Gi, nyere

m aka ugboro ugboro, za m oku. Onyenwe m za m oki n’ihi na obi oma Gi ebuka. Na

nnukwu ebere Gi, tugharia chee m ihu. Aziza

3. Unu bu umu ogbenye, leenu anya, ka obi too unu uto. Unu bu ndi na-acho Chineke, ka obi

unu juputa n’anuri. Maka na Onyenweanyi na-anu olu umu ogbenye. Anya Ya-anaghi apu

na ndi nke Ya e ji n’agbu. Ka eluigwe na ala too Ya. Ka osimiri na ihe nile na-emetu unara

n’ime ya too Onyenweanyi. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Pol di aso degaara ndi Rome 5: 12-15

Isi Okwu: Amara e nyere kariri odida a dara

Dika njo si n’aka otu nwoke wee bata n’uwa; onwu sokwara njo bata. Otu ahu ka onwu si rute

mmadu nile, maka na onye o bula emeela njo. Njo anoolari n’uwa ogologo oge tupu e nye iwu. Ma

ebe o bu na iwu adighi, o nweghi onye e nwere ike ibo ebubo na o mere njo nke ‘imebi iwu’. Ma

onwu chiri mmadu nile, bido n’Adam ruo na Mosis; o buladi na njo ha abughi imebi iwu dika nke

Adam. Adam bu onye e ji ama atu nke Onye Ahu gaje ibia. Ma amara e nyere jiri ihe buru ibu karia

Page 3: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA … · ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume; Gi bu onye ahu na-enyocha

odida a dara. O buru na o were anya, na mmadu dum sitere n’odida otu nwoke nwuo; o kara wee

anya na amara Chineke, nke sitere n’aka otu nwoke ahu bu Jesu Kristi, biara rute mmadu nile, dika

onyinye zuru oke, e nyere na nkiti.

Okwu nke Oseburuwa.

Ekele diri Chukwu.

ALELUYA

Ahleluya, aleluya! Onye o bula huru M n’anya ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahu ya n’anya. Anyi ga-

abiakwute ya. Aleluya!!!

OZIOMA di aso nke Matiu dere 10: 26-33

Isi Okwu: Ujo mmadu atula unu

Jesu gwara umuazu Ya si: “Unu atula ujo mmadu! N’ihi na ihe o bula e kpuchiri ekpuchi ugbua ga-

abu ihe e kpughere ekpughe. Nke o bula zoro ezo, ga-abu ihe a gbara n’anwu. Ihe M gwara unu

n’ochichiri, kwuonu ya n’ehihie ocha. Ihe M takwunyere unu n anti, kwusaanu ya n’elu ulo. Unu

atula egwu ndi ahu na-egbu ahu, ma ha enweghi ike igbu mkpuru obi. Kama tuonu egwu Onye ahu

nwere ike ime ka ahu na mkpuru obi laa n’iyii n’oku ala mmuo. Ihe a na-ere umu nza abuo o bughi

nani otu kobo? Ma nke o bula n’ime ha enweghi ike ida n’ala, ma o buru na Nna unu amaghi. Ma

otu o di, a guola agiri isi unu bu n’isi onu. Ya mere, unu atula egwu o bula. N’ihi na unu di oke onu

ahia karia otutu umu nnunu. “Ya mere, onye obula nke ga ekwuputa ya n’ihu mmadu, aga M

ekwuputa ya n’ihu Nna M no n’eluigwe. Ma onye o bula nke ga-agonari M n’ihu mmadu, aga M

agonari ya n’ihu Nna M no n’eluigwe.

Ozioma nke Oseburuwa.

Otito diri Gi, Kristi.

Page 4: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA … · ebi, nke a na-agaghi echefu echefu. Onyenweanyi nke igwe ndi agha, o bu Gi na-enyocha ndi ezi omume; Gi bu onye ahu na-enyocha

12TH SUNDAY REFLECTION

TERROR IN OUR LIVES

In this modern day, the terror we seem to know much about is that unleashed on regular basis by

Islamic extremists. This is so true because there is increasing number of terror attack across the

globe that we basically live in fear in this unsafe world. The religious cum political ideology of

these Muslim terrorists is so brazen and uncompromising that they tend to be unabated and

indomitable. There is terror in our neighborhoods, families, communities, churches and homes.

People love to terrorize and make life difficult for others. The only language terrorists know is that

of violence and destruction. They fight truth and champion injustice as a way to hide their wicked

acts. They hate to hear the truth and truncate any form of freedom. Often times, husbands

terrorize their wives and children, leaders terrorize their subjects, people conspire to terrorize

others who hold different view against them. The chief priests and leaders of the community could

no longer stand the glaring truth and exposition of their crimes and wickedness by Jeremiah and

thus they resorted to the plot to exterminate him from the root. The Lord encourages us not to

fear and to speak out the truth and witness to Him before the people. He has promised to reveal

all the secret emotions and plans of the evil people. Whatever is hidden will be revealed. Flow

with the spirit of prophet Jeremiah and standby the truth and defend justice. Be not an agent of

terror recruited by the other to unleash terror on innocent people. Be no slave to terror. Be not

part of the conspiracy to stiffen the truth. Truth is eternal and endures forever.

Happy Sunday!!

Produced by ICC Choir