4
IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN: 19 TH SUNDAY IN ORDINARY TIME (YEAR B); ICC FAMILY DAY SUNDAY, AUGUST 12, 2018 HYMNS: ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU OFFERTORY: SOM TOO CHUKWU/CHI N’EMERE M /TOBENNA CONSECRATION: EARTHLY GIFTS COMMUNION: ABU M ACHICHA DI NDU POST COMMUNION: TASTE & SEE/CARRIBEAN MEDLEY DISMISSAL: MMA MMA CHINEKE

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT … · ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O

Embed Size (px)

Citation preview

Page 1: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT … · ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O

IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW

YORK,

AT ANGELA MERICI PARISH,

BRONX, NEW YORK.

SUNDAY BULLETIN: 19TH SUNDAY IN

ORDINARY TIME (YEAR B); ICC

FAMILY DAY

SUNDAY, AUGUST 12, 2018 HYMNS:

ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU

OFFERTORY: SOM TOO CHUKWU/CHI N’EMERE M

/TOBENNA

CONSECRATION: EARTHLY GIFTS

COMMUNION: ABU M ACHICHA DI NDU

POST COMMUNION: TASTE & SEE/CARRIBEAN MEDLEY

DISMISSAL: MMA MMA CHINEKE

Page 2: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT … · ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O

EKPERE MMEGHE

Chineke ji ike nile di ndu ebighi ebi, biko mee ka mmuo nke anyi jiri buru umu Gi zuo oke n’ime

anyi. Ka obi sie anyi ike idi na-akpo Gi Nna; anyi ewee tozuo oke n’ibata n’oke ahu I kwere anyi na

nkwa. Site n’Onyenweanyi, Jesu Kristi Nwa Gi.

IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo Mbu Nke Ndi Eze 19:4-8

Isi Okwu: Agbamume o nwetara na nri ka o jiri gaa ije wee rute n’ugwu nke Chineke

Ilaija gara ije otu ubochi n’ime ozara wee rute n’okpuru otu oke osisi na-enye ndo. O rioro ka onwu

gbuo ya wee si: “Onyenwe m, ike uwa agwula m. Bia wepu ndu m n’ihi na akaghi m ndi nna nna m

ochie nwuru anwu. O wee dina ala n’ukwu osisi ahu, ura eburu ya. Ma otu mmuoma biara metee

ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu

mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O bia rie nri ňuokwa mmiri, biakwa dina ala ozo. Ma otu mmuoma

Onyenweanyi ahu biakwara ozo nke ugboro abuo metu ya aka si: “Ngwa kulite rie nri ka njem ghara

idiri gi oke ogologo.” O wee kulite rie nri, ňuokwa mmiri. Agbamume o nwetara na nri ahu ka o jiri

gaa ije iri ubochi ano, ehihie na abali wee rute na Horeb bu ugwu nke Chineke.

Okwu nke Oseburuwa.

Ekele diri Chukwu.

ABUOMA NA AZIZA YA 33:2-9, Az. 9

Aziza: Detu Ya Onu, ka i hu na Dinwenu di uto

1. Aga m agozi Onyenweanyi mgbe dum. Aga m akpu otito Ya n’onu m. Ka mkpuru obi m tobe

Onyenweanyi. Ndi umeala ga-anu olu m wee ňuria. Aziza

2. Soronu m too Onyenweanyi, Ka anyi jikotanu onu too Aha Ya. Achoro m Onyenweanyi, O

wee zaa m oku. O biara wepuru m ihe nile na-atu m egwu. Aziza.

3. Legide Ya anya ka anuri chawaputa gi n’ihu; ka ihere ghara ikpuchi gi ihu. Mgbe onye ahu

no na nsogbu kpokuru Onyenweanyi, O zara ya oku. O zoputara ya na mmekpa ahu ya nile.

Aziza.

4. Mmuoma nke Onyenweanyi gbara ndi na-asopuru Onyenweanyi gburugburu, iji gbaputa ha.

Detu Onyenweanyi onu ka i hu na O di uto. Aziza

IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Ozi nke Pol di aso degaara ndi Efesos 4:30-5:2

Isi Okwu: Soro nu Kristi site n’inwe udi ihunanya onwere

Unu emekwala ihe ga-ewute Mmuo Nso Chineke Onye a kara unu akara Ya, ka o buru akara e ji

agbaputa unu mgbe ubochi ahu ruru. Unu eburule ibe unu iwe na onuma n’obi. Unu ewela iwe

oku, ma o bu gwa onye o bula okwu n’olu ike. Unu ekwutokwala onye o bula, ma o bu kwuluo

onye o bula n’udi o bula. Kama nweritanu ihunanya n’etiti onwe unu; na-enwenu obi oma na obi

nro n’ahu ibe unu. Na-agbagharanu ibe unu, dika Chineke si gbaghara unu n’ime Kristi. Ebe unu bu

Page 3: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT … · ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O

umu Chineke huru n’anya, gbaanu mbo iňomi Chineke. Soronu Kristi site n’inwe udi ihunanya ahu

Kristi nwere maka unu; udi ihunanya ahu kpalitere Kristi iwere onwe Ya tinye n’onodu anyi, bia

chunyere Chineke aja nwere isi oma.

Okwu nke Oseburuwa

Ekele diri Chukwu.

ALELUYA Jon 14:23

Aleluya, aleluya!! Abu M Achicha di ndu, nke si n’eluigwe gbadata. Onye o bula riri Achicha nke a,

ga-adi ndu ebighi ebi. Aleluya!!!

OZIOMA nke si n’Ozioma di aso Jon dere Jon 6: 41-51

Isi Okwu: A bum achicha di ndu nke si n’eluigwe gbadata

Ndi Juu bidoro itamu ntamu, n’ihi na Jesu kwuru si: “Abu M achicha ahu si n’eluigwe gbadata.” Ha

juwa si: “Onye a, o bughi Jesu, nwa Josef? O bu na anyi amaghi nna ya na nne ya? Gini mere O ji

ekwu ugbu a si: “E si M n’eluigwe gbadata?” Jesu wee zaa ha si: “Ngwa, kwusinu ntamu ahu unu

na-atamu. O dighi onye o bula nwere ike ibiakwute M karikwa ma Nna M Onye zitere M, mere ka o

biakwute M. Aga M ebilite ya n’onwu n’ubochi ikpeazu. E dere ya n’Akwukwo ndi amuma si:

“Chineke ga-akuziri ha dum ihe!” Inu ihe Nna kuziri na isi na ya muru ako bu ibiakwute M. O

putaghi na e nweela mmadu nkiti jirila anya nkiti hu Nna, kariakwa Onye ahu si na Chineke bia. O

jila anya Ya hu Nna. N’igwa unu ezi okwu: Onye o bula kwerenu nwere ndu ebighi ebi. Abu M

achicha nke ndu. Nna unu ha riri achicha ocha (mana) n’ime ozara. Ma ha anwuola. Ma nke a bu

achicha ndu si n’eluigwe gbadata, nke o ga-abu, onye rie ya, o gaghi anwu anwu. Abu M achicha di

ndu nke si n’eluigwe gbadata. Onye obula riri achicha nke a ga-adi ndu ebighi ebi. Achicha ahu M

ga-enye bu anu ahu M, maka ndu nke uwa.”

Ozioma nke Oseburuwa.

Otito diri Gi, Kristi.

EKPERE NHUNYE

Onyenweanyi, I sitere n’ebere Gi nye anyi onyinye nke a anyi na-ebutere Gi. Biko nara aja Nzuko Gi

na-ehunyere Gi iji medaa Gi obi. Mee ka anyi site na ya bata n’ihe omimi nke nzoputa anyi. Site na

Kristi Dinwenu anyi.

EKPERE A NATACHAA ORIRI NSO

Onyenweanyi, biko mee ka ahu na obara Nwa Gi nke anyi natara wetara anyi nzoputa. Mee ka anyi

jidesie aka ike n’ihe nke ezi okwu Gi. Site na Kristi Dinwenu anyi.

Page 4: IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW YORK, AT … · ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O

[19TH SUNDAY IN ORDINARY TIME REFLECTION]

Theme: Have you ever gotten tired of living and gave up on God?

How often have you paid attention to your feelings and felt like your life is in a mess or that life is

useless. Any frustrations and depressions? Disappointments? Is it because of betrayals by wife or

husband, friend or family member or church member? Is your relationship in jeopardy? Do you

suffer discrimination at job or school? Probably, your academic life is getting nowhere or your

immigration status seems unsolvable? It maybe that you are serving the community and the people

are castigating you and spreading false rumors about you. Do you have trouble paying your bills?

Everything seems to be working against you and people are making mockery of you. Such was the

fate of Jeremiah [chpt20:7-18] that he even cursed the day he was born. Today, Elijah has spoken in

the name of the Lord and was running away from his persecutors. He was tired and hungry. He

was in a hopeless situation but the Lord sent an angel and fed him through the raven. He prepared

him for the great task ahead. “When I think my foot is slipping, Your faithful love upholds me”-

Ps94:18. The 2nd reading tells us to shun all kinds of bitterness, anger, shouting, name-calling,

backbiting, malice, bickering, jealousy, gossips, etc. We were rather encouraged to share love,

forgive and be generous to one another. We will unite in love and come to the table of the Lord.

We can then participate in the breaking and sharing of the bread from heaven, the body of Jesus

Christ. 'Ecce quam bonum et iucundum frates habitare in unum' Behold, how good and delightful it

is for brothers to live together'- [Psalm133:1]

Produced by ICC Choir