IGBO CATHOLIC COMMUNITY OF NEW
YORK,
AT ANGELA MERICI PARISH,
BRONX, NEW YORK.
SUNDAY BULLETIN: 19TH SUNDAY IN
ORDINARY TIME (YEAR B); ICC
FAMILY DAY
SUNDAY, AUGUST 12, 2018 HYMNS:
ENTRANCE: K’ANYI JEE N’ULO CHUKWU
OFFERTORY: SOM TOO CHUKWU/CHI N’EMERE M
/TOBENNA
CONSECRATION: EARTHLY GIFTS
COMMUNION: ABU M ACHICHA DI NDU
POST COMMUNION: TASTE & SEE/CARRIBEAN MEDLEY
DISMISSAL: MMA MMA CHINEKE
EKPERE MMEGHE
Chineke ji ike nile di ndu ebighi ebi, biko mee ka mmuo nke anyi jiri buru umu Gi zuo oke n’ime
anyi. Ka obi sie anyi ike idi na-akpo Gi Nna; anyi ewee tozuo oke n’ibata n’oke ahu I kwere anyi na
nkwa. Site n’Onyenweanyi, Jesu Kristi Nwa Gi.
IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo Mbu Nke Ndi Eze 19:4-8
Isi Okwu: Agbamume o nwetara na nri ka o jiri gaa ije wee rute n’ugwu nke Chineke
Ilaija gara ije otu ubochi n’ime ozara wee rute n’okpuru otu oke osisi na-enye ndo. O rioro ka onwu
gbuo ya wee si: “Onyenwe m, ike uwa agwula m. Bia wepu ndu m n’ihi na akaghi m ndi nna nna m
ochie nwuru anwu. O wee dina ala n’ukwu osisi ahu, ura eburu ya. Ma otu mmuoma biara metee
ya, tiere ya iwu ka o bilie rie nri. O wee legharia anya hu ogbe achicha e ghere eghe na otu udu
mmiri n’akuku ebe o hiliri isi. O bia rie nri ňuokwa mmiri, biakwa dina ala ozo. Ma otu mmuoma
Onyenweanyi ahu biakwara ozo nke ugboro abuo metu ya aka si: “Ngwa kulite rie nri ka njem ghara
idiri gi oke ogologo.” O wee kulite rie nri, ňuokwa mmiri. Agbamume o nwetara na nri ahu ka o jiri
gaa ije iri ubochi ano, ehihie na abali wee rute na Horeb bu ugwu nke Chineke.
Okwu nke Oseburuwa.
Ekele diri Chukwu.
ABUOMA NA AZIZA YA 33:2-9, Az. 9
Aziza: Detu Ya Onu, ka i hu na Dinwenu di uto
1. Aga m agozi Onyenweanyi mgbe dum. Aga m akpu otito Ya n’onu m. Ka mkpuru obi m tobe
Onyenweanyi. Ndi umeala ga-anu olu m wee ňuria. Aziza
2. Soronu m too Onyenweanyi, Ka anyi jikotanu onu too Aha Ya. Achoro m Onyenweanyi, O
wee zaa m oku. O biara wepuru m ihe nile na-atu m egwu. Aziza.
3. Legide Ya anya ka anuri chawaputa gi n’ihu; ka ihere ghara ikpuchi gi ihu. Mgbe onye ahu
no na nsogbu kpokuru Onyenweanyi, O zara ya oku. O zoputara ya na mmekpa ahu ya nile.
Aziza.
4. Mmuoma nke Onyenweanyi gbara ndi na-asopuru Onyenweanyi gburugburu, iji gbaputa ha.
Detu Onyenweanyi onu ka i hu na O di uto. Aziza
IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Ozi nke Pol di aso degaara ndi Efesos 4:30-5:2
Isi Okwu: Soro nu Kristi site n’inwe udi ihunanya onwere
Unu emekwala ihe ga-ewute Mmuo Nso Chineke Onye a kara unu akara Ya, ka o buru akara e ji
agbaputa unu mgbe ubochi ahu ruru. Unu eburule ibe unu iwe na onuma n’obi. Unu ewela iwe
oku, ma o bu gwa onye o bula okwu n’olu ike. Unu ekwutokwala onye o bula, ma o bu kwuluo
onye o bula n’udi o bula. Kama nweritanu ihunanya n’etiti onwe unu; na-enwenu obi oma na obi
nro n’ahu ibe unu. Na-agbagharanu ibe unu, dika Chineke si gbaghara unu n’ime Kristi. Ebe unu bu
umu Chineke huru n’anya, gbaanu mbo iňomi Chineke. Soronu Kristi site n’inwe udi ihunanya ahu
Kristi nwere maka unu; udi ihunanya ahu kpalitere Kristi iwere onwe Ya tinye n’onodu anyi, bia
chunyere Chineke aja nwere isi oma.
Okwu nke Oseburuwa
Ekele diri Chukwu.
ALELUYA Jon 14:23
Aleluya, aleluya!! Abu M Achicha di ndu, nke si n’eluigwe gbadata. Onye o bula riri Achicha nke a,
ga-adi ndu ebighi ebi. Aleluya!!!
OZIOMA nke si n’Ozioma di aso Jon dere Jon 6: 41-51
Isi Okwu: A bum achicha di ndu nke si n’eluigwe gbadata
Ndi Juu bidoro itamu ntamu, n’ihi na Jesu kwuru si: “Abu M achicha ahu si n’eluigwe gbadata.” Ha
juwa si: “Onye a, o bughi Jesu, nwa Josef? O bu na anyi amaghi nna ya na nne ya? Gini mere O ji
ekwu ugbu a si: “E si M n’eluigwe gbadata?” Jesu wee zaa ha si: “Ngwa, kwusinu ntamu ahu unu
na-atamu. O dighi onye o bula nwere ike ibiakwute M karikwa ma Nna M Onye zitere M, mere ka o
biakwute M. Aga M ebilite ya n’onwu n’ubochi ikpeazu. E dere ya n’Akwukwo ndi amuma si:
“Chineke ga-akuziri ha dum ihe!” Inu ihe Nna kuziri na isi na ya muru ako bu ibiakwute M. O
putaghi na e nweela mmadu nkiti jirila anya nkiti hu Nna, kariakwa Onye ahu si na Chineke bia. O
jila anya Ya hu Nna. N’igwa unu ezi okwu: Onye o bula kwerenu nwere ndu ebighi ebi. Abu M
achicha nke ndu. Nna unu ha riri achicha ocha (mana) n’ime ozara. Ma ha anwuola. Ma nke a bu
achicha ndu si n’eluigwe gbadata, nke o ga-abu, onye rie ya, o gaghi anwu anwu. Abu M achicha di
ndu nke si n’eluigwe gbadata. Onye obula riri achicha nke a ga-adi ndu ebighi ebi. Achicha ahu M
ga-enye bu anu ahu M, maka ndu nke uwa.”
Ozioma nke Oseburuwa.
Otito diri Gi, Kristi.
EKPERE NHUNYE
Onyenweanyi, I sitere n’ebere Gi nye anyi onyinye nke a anyi na-ebutere Gi. Biko nara aja Nzuko Gi
na-ehunyere Gi iji medaa Gi obi. Mee ka anyi site na ya bata n’ihe omimi nke nzoputa anyi. Site na
Kristi Dinwenu anyi.
EKPERE A NATACHAA ORIRI NSO
Onyenweanyi, biko mee ka ahu na obara Nwa Gi nke anyi natara wetara anyi nzoputa. Mee ka anyi
jidesie aka ike n’ihe nke ezi okwu Gi. Site na Kristi Dinwenu anyi.
[19TH SUNDAY IN ORDINARY TIME REFLECTION]
Theme: Have you ever gotten tired of living and gave up on God?
How often have you paid attention to your feelings and felt like your life is in a mess or that life is
useless. Any frustrations and depressions? Disappointments? Is it because of betrayals by wife or
husband, friend or family member or church member? Is your relationship in jeopardy? Do you
suffer discrimination at job or school? Probably, your academic life is getting nowhere or your
immigration status seems unsolvable? It maybe that you are serving the community and the people
are castigating you and spreading false rumors about you. Do you have trouble paying your bills?
Everything seems to be working against you and people are making mockery of you. Such was the
fate of Jeremiah [chpt20:7-18] that he even cursed the day he was born. Today, Elijah has spoken in
the name of the Lord and was running away from his persecutors. He was tired and hungry. He
was in a hopeless situation but the Lord sent an angel and fed him through the raven. He prepared
him for the great task ahead. “When I think my foot is slipping, Your faithful love upholds me”-
Ps94:18. The 2nd reading tells us to shun all kinds of bitterness, anger, shouting, name-calling,
backbiting, malice, bickering, jealousy, gossips, etc. We were rather encouraged to share love,
forgive and be generous to one another. We will unite in love and come to the table of the Lord.
We can then participate in the breaking and sharing of the bread from heaven, the body of Jesus
Christ. 'Ecce quam bonum et iucundum frates habitare in unum' Behold, how good and delightful it
is for brothers to live together'- [Psalm133:1]
Produced by ICC Choir